Peter E Dimgba - Ka Anyi Naa Ya Nti

Ị nwere ihe karịrị Chineke, biko ribe ya enyelam
Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ na elu uwa
Nwanne cherekwe, Chukwu kere gi ya kere igwe na ala
Obugi onye buru ụzọ gbaba ọsọ na-agbata ihe a na agba n'ọsọ

Ka anyị ñaa ya ntị
Ọ bụ oji ji jide mma
Ka Anyị ñaa ya ntị
Mmalite n'ọgwugwu bụ aha ya
Ka anyị ñaa ya ntị
Ọ mazuru ihe n'iile
Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ

Dika anyị na-achụ ego ụwa ka anyị kwuba aka anyị ọtọ
Hapụ oke ọchụchọ, ogechi ka ya nma
Ijiji ikenti na esoro ozu we lawazie
Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ

Ị nwere ihe karịrị Chineke, biko ribe ya enyelam
Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya na ọsọ nʼelu ụwa
Nwanne cherekwe, Chukwu kere gi ya kere igwe na ala
Ọ bughị onye buru ụzọ gbaba ọsọ na-agbata ihe a na agba n'ọsọ

Ka anyị ñaa ya ntị
Ọ bụ oji ji jide mma
Ka Anyị ñaa ya ntị
Mmalite n'ọgwụgwụ bụ aha ya
Ka anyị ñaa ya ntị
Ọ mazuru ihe n'iile
Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ

Ọnwụnwa bia n'ụzọ mụ
Ọ bụkwa ya Kam ga akọsara
Ndi enyi haripu mụ
Ọ bụkwa ya Kam ga akọsara
Ịkwu na ibe kpọm asị
Ọ bụkwa ya Kam ga akọsara
Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ

Written by:
Peter Dimgba

Publisher:
Lyrics © O/B/O DistroKid

Lyrics powered by Lyric Find

Peter E Dimgba

View Profile