FadaBarto - N'Aja Missa Di Aso

Chukwu lekwa ndị Gị o! (lekwa anyị o, anyị abịa!)
Anyị gbakọrọ n'ihu Gị o! (lekwa anyị o, Olisa bi n'igwe!)
Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!)
Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị
Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!)
K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ!
Anụrị juru m obi mgbe m nụrụ ka ha kwuru sị
K'anyị jee n'ụlọ nsọ; n'ụlọ nsọ Chineke
Chukwu eh lee mo!
Abịara m n'ihu Gị!
Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!)
Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị
Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!)
K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ!
Ugo niile ebelụsịgo inye Gị ekele!
Ụmụ nnụnụ nke igwe
Anụ bi n'ọhịa, ọnwa na kpakpando na ihe niile I kere eke
Anyị guzoro n'ihu Gị!
Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!)
Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị
Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!)
K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ!
Lee ka Ụlọobibi Gị siri makarịsịa mma
N'ezie ha bụ ndị a gọziri agọzi
Bụ ndị bi n'ụlọ Gị na-ekwere Gị ukwe otito oge niile, oh!
Ọ ga-amasị m isoro ha kwebeere Gị ukwe ọñụ!
Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!)
Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị
Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!)
K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ!
Otu ụbọchị na be Gị ka mma
Karịa nnụ kwuru nnụ afọ n'ebe ọzọ
Chukwu eh, abịara m n'obi Gị!
Inye gị ekele maka ọgọ Gị niile! (Chukwu mo!)
Inye Gị otito na ofufe kwesịrị Gị
Kọkwaara Gị mkpa anyị, yọọ Gị mgbaghara n'aja Missa (Chiọma mo!)
K'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị yọọ Gị mgbaghara n'aja Mịssa dị asọ!

Written by:
Rev. Fr. Bart Ezeokafor

Publisher:
Lyrics © O/B/O DistroKid

Lyrics powered by Lyric Find

FadaBarto

View Profile